ỌBỊBỊA NDỊ IROPU NA USORO OBIBI NDỤ NA MMỤTA NDỊ IGBO: ỌDỊDỊ NA OLILEANYA

I. L. Akpu (PhD), A. O. Medolu (PhD), Virginus Onyebuchi Aruah

Abstract


Nchọcha a na-eleba anya n’ihe bụ ebumnoobi ndị Iropu mere ha ji bịa ala Igbo.Ndị Igbo dịka otu agbụrụ, bikọtara n’otu ebe a maara dịka ala Igbo. Ha nwere asụsụ Igbo dịka asụsụnne na nna ha. Ha nwekwara ọtụtụ olundị dị iche iche ha na-asụ ma nwezie otu asụsụ Igbo nke onye ọ bụla na-aghọta. Nke a ka ha kpọrọ Igbo izugbe. Ọ na-eme ka nghọta dị mfe na mmekọrịta ọ bụla ha nwere. Nchọcha a na-egosikwa na ndị Igbo nwere omenala e ji mara ha, ụzọ okpukperechi, nkwenye na obibi ndụ nke ha tupu ndị ọcha (Iropu) a bịa n’ala Igbo. Ọzọ, a gbasoro usoro nkọwa wee tụchaa nchọcha a. Nchọpụta e nwetere gosiri na ebumnoobi ndị ọcha ha ji bịa ala Igbo abụghị iweta ọganiihu kama ọ bụ ka ha bịa bukọrọ akụ ndị ahụ Chineke jiri gozie ụmụ Igbo laa na be ha.  Arụtụkwara aka na mmetụta nke ọbịbịa ha nye ndụ ndị Igbo n’akụkụ nke azụmaahịa, ọrụ aka, agụmaakwụkwọ, okpukperechi, omenala, ọchịchị,nkwenye nakwa  ọgwụgwọ  ọrịa.A gakwara n’ihu chọpụtammetụta nke ọbịbịa  ha nye asụsụ Igbo, ejiji, ihe gbasara ụmụnwaanyị nakwa akparamaagwa ụmụ Igbo. N’ikpeazụ, e lebara anya n’ihe ọbịbịa ha mebiri nakwa ndị o meziri na ndụ ndịIgbo (ihe dị mma ha webatara).A tụtakwara aro banyere etu a ga-esi mezie ihe ndị ahụ ọbịbịa ha mebiri ma kwue ihe ga-abụ olileanya ndị Igbo n’ ọdịniihu.

Full Text:

PDF

References


Agụgụ, M.O. (2006). Ndị Igbo na akụkọ ala ha. Nsụka: Matag printing and publishing enterprises.

Anozie, C.C. (2003). Igbo kwenụ (Akụkọna omenala ndị Igbo). Enugu: Computer edge publishers.

Apakama, L.C. (2009). The use of Engligbo in egwuọnwa: A signal of Igbo language endangerment. A paper presented at the National Conference of the Department of Music, A.I.F.C.E, Owerri. 14th -16th October, 2019.

Ekwealor, C.C. (1998). Omenala na ewumewu Igbo. Owerri: Africana first publishers.

Epuchie, D.N. (2009). Asụsụ Igbo n’oge ochie na oge ugbua.Opiike. Journal of Igbo Language and Culture, 1(1).

Mbata, C.O. (2002). Mmalite ndị Igbo in Nigerian languages for colleges of education. Owerri: Lajec publication.

Ọnwụzuruike, D.O. (1962). History of Nigeria in a new setting. Aba: The international press.

Udeze, C.V. (2004). Mmekọrịta nandụ ndị Igbo n’ụzọ omenala. Igbo Ga-adị. Journal of Igbo Studies. Department of Linguistics and Nigerian Languages A.I.F.C.E, Owerri.

Umoh, U.C. na Ezema, T.O. (2007). Mkpanaka nchọcha n’asụsụ na omenala Igbo. Nsụka: Ifedimma communication.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2021 I. L. Akpu (PhD), A. O. Medolu (PhD), Virginus Onyebuchi Aruah

 

 

ISSN: 3027-0510 (Online)

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.