IHE NDỊ NA-EWETA IHE MHIAMAHỤ NYE NDỊ NKỤZI IGBO N’ITINYE IGWE NKỤZI N’ỌRỤ NA NKỤZI ASỤSỤ IGBO
Abstract
O nweghị etu mmadụ ga-esi ga n’ihu n’ụwa nke taa ma ọ bụrụ na ọ maghị etu e si etinye igwe komputa n’ọrụ. Ọ bụ ya kpatara na ihe niile a na-eme n’ụwa taa bụ ozuru Igbo ọnụ maka na a na-eji igwe kọmputa zisaa ozi ọ bụla n’ụwa gburugburu n’otu ntabi anya. ICT emeela ka e nwee nnukwu ihe mgbanwe n’ọnọdụ nkuzi nke na mgbe na-abịa oge ọ ga-abụzi naanị ụlọ akwụkwọ ole na ole ka ga na-eji ụgbọ ojii na nzu edide akụziri ụmụ akwụkwọ ihe. Ihe bụzi egwu e ji ugbu a n’ọrụ nkụzi bụ mfanye efere ozi na kọmputa, iji ọwa ozi akụzi ihe, igwe ngosi projektọ, d.g. Ederede a gbara n’anwụ ihe ndị ahụ na-ewetara ndị nkụzi Igbo na ụmụ akwụkwọ ihe nhịamahụ n’iji igwe kọmputa na ọwa ozi amụ Igbo. Ọ kọwapụtakwara mkpa ọ dị ịgba ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ume itinye ICT n’ọrụ na nkụzi na amụmakwụkwọ. A gbara ajụjụ ọnụ iji nweta ozi e ji kwado isi okwu ederede a. Site na nchọcha e mere, a chọpụtara na ọtụtụ ndị nkụzi asụsụ Igbo amabeghị etu e si e ji ICT akụzi ihe nke mere ka ọtụtụ ụmụ akwụkwọ ghara ịghọtakwa mkpa nke a dị. E si n’ihe ndị a chọpụtara wee tụa arọ ihe a ga-eme ka nsogbu nchọcha a belata. Ederede a ga-abara otu niile na-ahụ maka nchekwa asụsụ Igbo dị ka otu Subakwa Igbo uru n’ihi na ọ ga-eme ka ha mara usoro ọgbara ọhụrụ e si echekwa asụsụ Igbo na-achọ ịnwụ anwụ. Ọ ga-abara ndị na-edepụta ózí ńrò aka ịma ụdị ga-aka mma imeputa n’oge ọ bụla a nọ maka ezigbo nkụzi na nghọta asụsụ. Ederede a ga-abakwara ụmụ akwụkwọ Igbo uru n’ihi na ọ ga-enyere ha aka ịmụ Igbo n’ụzọ dị mfe n’onwe ha n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha nọ n’ụwa.
Full Text:
PDFReferences
Akudolu, I. (2004). Teaching the language arts. Enugu: John Jacob’s Classic Publishers Ltd.
Allen, R. (2003). Entering the main stream: the quality and extent of online education in the United States. Needham. M.A Sloan Centre for Online Education
Crozier, D.H and R.M Blench (1992). An index of Nigerian languages. (eds) second edition. Dallas:
Institute of Linguistics, Inc.
D’ Ovile, H. (2008). Globalization and language: our heritage. Paris: UNESCO Federal Republic of Nigeria (2004). National policy on education. Abuja:NERDC
Grimes, B.F. (2000). Ethnologue: languages of the world. Fourteenth edition. Sil international
Heine, B. and Nurse, D. (2000). African languages: An Introduction. Cambridge: Cambridge University Press
Misko, J., Choi, J., Hong, S.Y, and Lee I.S, (2005). E-learning in Australia and Korea: learning from practice.
Neuhauser, L. (2002). Learning style and effective of online and face to face instruction. American journal of distance education 16(2) 99 – 113.
Ololube, N.P., Udogu, A.E., and Ossai, A.G (2010). E-learning and teacher preparation in Nigeria. A paperpresented at the 2012 annual conference of the Faculty of Education, Nnamdi Azikiwe University, Awka.
Oyetade, S.O. (2001). Attitude to foreign languages and indigenous language use in Nigeria. In H. Igboanusi (ed.) Language attitude and language conflict in West Africa. Ibadan: Enicrownfit publishers. 14.29.
Udoye, I.E (2012). Orientation of public and private schools to the acquisition of English and Nigerian languages: a case study. Journal of communicative English. Makurdi: University of Agricult
Refbacks
- There are currently no refbacks.
Copyright (c) 2022 Daniel Ihunanya Ilechukwu, Chiamaka Patience Ilechukwu, Chiamaka Patience Ilechukwu
ISSN: 3027-0510 (Online)
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.