NDỊ ARA: KA HA SI PỤTA IHE N’AGỤMAGỤ NDỊ A HỌỌRỌ

Chinenye C. Olekaibe (PhD), Perpetua Ugochi Nduka, Faith Chinonso Obumneke

Abstract


Ọrịa ara abụghị ihe ọma n’ụdị ya ọ bụla. Ọ na-ewetu ugwu mmadụ ala ma mee onye ahụ ka ọ hapụ isonye n’ihe a na-eme. Onye ọ bụla ọrịa a bụ ara bịara, ka ndị mmadụ na-ewere ka onye na-enweghị isi na mmadụ ya na onye na-enweghị uru ọ bara. Ọzọ, onye ara bụ onye ndị mmadụ na-ahụta dịka onye na-ebutere ndị mmadụ nsogbu na gbagharịa site n’agwa ha ọtụtụ oge. Ọ bụ ụdị ọnọdụ a ndị mmadụ si ahụta ndị ara bụ ihe kpaliri mmụọ ndị odee a mere ha jiri chọọ ka ha mata ụdị nsogbu dị iche iche ndị ara nwere ike ibutere ndị mmadụ oge ụfọdụ site n’ụdị agwa ha na-akpa. Ndị odee a tinyere anya n’ihe ndị mmadụ derela n’agụmagụ Igbo iji mejupụta ọchịchọ obi ha. E ji agụmagụ Igbo anọ wee mee nchọcha a, nke gụnyere Isi Akwụ Dara N’ala nke Tony Ubesie dere, Obidiya nke Enyinna Akọma dere, Oguamalam nke Chike Osita Gbujie dere na Eriri Mara Ngwugwu nke G.O. Onyekaọnwụ dere. Atụtụ e ji mee nchọcha a bụ nke Goffman hiwere n’afọ 1952. Ihe ndị nchọcha a chọpụtara gụnyere ihe bụ ara/ndị ara, ihe ndi ̣e ji ama onye ara, ụdị ara dị iche iche, ihe ndị na-akpata ara, ọghọm na-adakwasị ndị ara, ọnọdụ ara n’ala Igbo taa, ihe a ga-eme ka ọnọdụ a belata na ka o si pụta ihe n’agụmagụ ndị a họọrọ. Ndị nchọcha a chịkọtara okwu ha site n’ikwu na oge ụfọdụ na omume ndị ara nwere ike ibutere ndị mmadụ nsogbu.


Full Text:

PDF

References


Akọma, E. (1977). Obidiya. Ibadan: Oxford University press.

Chinagorom, L.C. (2013). Uru Ezi Akanka n’Agumagu Igbo Ugbu a. Owerri: I.O. Publishers.

Epuchie, D.N. (2012). Ọnọdụ onyeara n’Iduuazi na ejije Igbo: site n’irụtụ aka n’isi akwụ dara n’ala, Obidiya, Nwa ngwii puo eze, onye kpaa nkụ ahụhụ na eriri mara ngwugwu. Qja International journal of Igbo, African and Asian studies. Apple Books press.

Gbujie, C.O. (1979). Oguamalam. Ibadan: Macmillan Nigeria Publishers.

Goftman, E.L. (2014). Sociological Theory. Singapore: Mc.Graw Hill Education

Ikeokwu, E. (2002). Nigerian Languages for Colleges of Education. Owerri: Cajec Publications.

Nwadike, I.U. (1982). Agụagafe n’Igbo. Ihiala: Deo Gratias Publishers.

Nwokoye, N.A. (2012) Poetic Devices in Igbo Poems. Qja Journal of Asian and African Studies No. 2 Pg. 104.

Okeyika, J.I. (2021). Agụmagụ Ederede Igbo Dika Enyo E ji Ahụta Ndụ: Ileba Anya n’Agụmagụ Ụkwa Ruo Oge ya na Isi Akwụ Dara N’ala. Enyo Jọnal otu ndị ji edemede akwalite asụsụ na Omenala Igbo. Vol. 2., Nọmba 1, Juun, 2020.

Okoro, L.C. (2012). Ndubata N’Agụmagụ Ederede Igbo. Owerri: Trumpters Concept.

Olekaibe, C.C. et al (2020). Igbo Ozuzu Maka Mmụta Dị Elu. Owerri. ASCON Publishers.

Olekaibe, C.C., (2020). Igbo Ozuzu Maka Mmụta dị elu. Owerri: Ascon Publishers.

Onyekaọnwụ, G.O. (1985). Eriri Mara Ngwugwu Ederede Igbo. Owerri: Trumpters Concept.

Porter, R. (1987). Madness: A brief istory. New York: Oxford University press.

Ọnụụwa, R. (2023). Ajujuonu n’Umuagwo Ohaji June 10, 2023.

Ubesie, T.U. (1973). Isi Akwu Dara N’Ala. Ibadan: Oxford University press.

Zereuwa, E. (2023). Ajujuonu n’Umuagwo Ohaji May 2, 2023.


Refbacks

  • There are currently no refbacks.


Copyright (c) 2023 Chinenye C. Olekaibe (PhD), Perpetua Ugochi Nduka, Faith Chinonso Obumneke

 

 

ISSN: 3027-0510 (Online)

 

   

 

Creative Commons License
This work is licensed under a Creative Commons Attribution-NonCommercial 4.0 International License.